Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 65:23-25 Bible Nso (IGBOB)

23. Ha agaghi-adọb͕u onwe-ha n'ọlu n'efu, ha agaghi-amu umu nye obi-ọlulọ-miri: n'ihi na nkpuru nke ndi Jehova gọziworo ka ha bu, ha na umu gēsi n'aru-ha puta.

24. O gēru kwa na, tutu ha akpọ, Mu onwem gāza; mb͕e ha onwe-ha nọ nēkwu okwu, Mu onwem gānu.

25. Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gātakọ nri n'otù, ọdum gāta kwa ahihia dika ehi: ma agwọ, ájá gābu nri-ya. Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile, ka Jehova siri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 65