Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 65:20-25 Bible Nso (IGBOB)

20. Ọ dighi nwa ọhu nwuchuru anwuchu gēsite kwa n'ebe ahu ọzọ, ma-ọbu agadi nke nānọzughi ubọchi ndu-ya: n'ihi na nwata gānwu mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise, agākọcha kwa onye-nmehie mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise.

21. Ha gēwu kwa ulo, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, rie nkpuru-ha.

22. Ha agaghi-ewu ulo, onye ọzọ ebichie; ha agaghi-aku, onye ọzọ erie: n'ihi na dika ubọchi nile nke osisi si di, otú a ka ubọchi nile nke ndim gādi, ndi M'rọputaworo gēnwe kwa ihe aka-ha lutara mb͕e di anya nke-uku.

23. Ha agaghi-adọb͕u onwe-ha n'ọlu n'efu, ha agaghi-amu umu nye obi-ọlulọ-miri: n'ihi na nkpuru nke ndi Jehova gọziworo ka ha bu, ha na umu gēsi n'aru-ha puta.

24. O gēru kwa na, tutu ha akpọ, Mu onwem gāza; mb͕e ha onwe-ha nọ nēkwu okwu, Mu onwem gānu.

25. Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gātakọ nri n'otù, ọdum gāta kwa ahihia dika ehi: ma agwọ, ájá gābu nri-ya. Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile, ka Jehova siri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 65