Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 65:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ekwerem ka ndi nājughi ajuju chọm; ekwerem ka ndi nāchọsighm ike chọtam: asirim otù mba nke nākpọkughi aham, Lekwam.

2. Ab͕asawom akam abua ogologo ubọchi nile nye otù ndi nke nēwezuga onwe-ha, ndi nēje ije n'uzọ nādighi nma, nēso èchìchè nile nke aka ha;

3. bú ndi ahu nke nākpasum iwe n'irum mb͕e nile, nāchu àjà n'ubi nile agbara-ogige, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu brick nile;

4. ndi nānọdu n'etiti ílì, nānọ kwa ọnọdu-abali n'ebe nile echebeworo na nzuzo; ndi nēri anu ezì, ofé nke ihe-árú di iche iche di kwa n'ihe-isi-ite nile ha;

5. ndi nāsi, Guzoro onwe-gi iche, abiarula nsom, n'ihi na edowom i ihe nsọ: ndia bu anwuru-ọku n'imim, ọku nke nēre ogologo ubọchi nile.

6. Le, ọ bu ihe edeworo n'akwukwọ n'irum: M'gaghi-agba nkiti, kama M'gākwughachi, e, M'gākwughachi n'obi-ha,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 65