Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 63:5-19 Bible Nso (IGBOB)

5. M'we legide anya, ma ọ dighi onye nēne aka; ibobo we nwuam n'aru na ọ̀ dighi onye nākwagide: ogwe-akam we wetaram nzọputa; ọnumam kwa, ya kwagiderem.

6. M'we zọda ndi di iche iche n'iwem, me ka ha ṅubiga ihe-ọṅuṅu nābà n'anya n'ọnumam, M'we me ka ọbara-ndu-ha ruda n'ala.

7. Ebere nile nke Jehova ka M'gēhota, ha na otuto nile nke Jehova, dika ihe nile si di nke Jehova mesoworo ayi; na iba-uba nke ezi ihe emere ulo Israel, nke O mesoworo ha dika obi-ebere-Ya nile si di, na dika iba-uba nke ebere-Ya si di.

8. O we si, N'ezie, ndim ka ha bu, umu ndi nādighi-ekwu okwu-ugha: O we ghọrọ ha onye-nzọputa.

9. Na nkpab͕u nile ha Ya ka anākpab͕u, ọ bu kwa mọ-ozi nke iru-Ya zọputara ha: n'ihu-n'anya-Ya na n'ọmiko-Ya Ya onwe-ya b͕aputara ha; O we palie ha, kuru ha ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.

10. Ma ndi ahu nupuru isi, me ka o wuta Mọ Nsọ Ya: O we chigharia ghọrọ ha onye-iro, Ya onwe-ya busoro ha agha.

11. Ndi-Ya we cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga nke Moses, si, Òle ebe Onye ahu nọ nke mere ka ha si n'oké osimiri rigoputa n'aka onye nāzù ìgwè ewu na aturu-Ya? òle ebe Onye ahu nọ nke tiyere Mọ Nsọ Ya n'etiti ha?

12. Nke nēme ka ogwe-aka-Ya mara nma je ije n'aka-nri Moses? Nke nēkewa miri n'iru ha, imere Onwe-ya aha ebighi-ebi?

13. Nke nēme ka ha je ije n'ob͕u-miri dika inyinya n'ọzara, ha we ghara isu ngọngọ?

14. Dika anu-ulo nke nārida na ndagwurugwu, otú a ka Mọ nke Jehova nēme ka ha zuru ike: otú a ka I duru ndi-Gi, imere Onwe-gi aha mara nma.

15. Si n'elu-igwe legide anya, si kwa n'ebe-obibi nke idi-nsọ-Gi na nke ima-nma-Gi le: òle ebe ekworo-Gi na idi-ike-Gi nile di? idà-udà nke ngiri-afọ-Gi na obi-ebere-Gi nile n'ebe m'nọ jisiri onwe-ha ike.

16. N'ihi na Gi onwe-gi bu Nna-ayi; n'ihi na Abraham amaghi ayi, Israel adighi-amata kwa ayi: Gi onwe-gi, Jehova, bu Nna-ayi; Onye-nb͕aputa-ayi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka aha-Gi bu.

17. Jehova, n'ìhi gini ka I nēme ka ayi si n'uzọ-Gi nile kpafue? n'ìhi gini ka I nēme ka obi-ayi si n'egwu-Gi sie ike? Lata n'ihi ndi-orù-Gi, bú ebo nile nke ihe-nketa-Gi.

18. Ọ bu nání mb͕e ntà ka ndi nsọ Gi nwetara ya: ndi nākpab͕u ayi azọdawo ebe nsọ Gi.

19. Ayi aghọwo ndi I nāchighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi anākpọkwasighi ha aha-Gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 63