Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 61:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Mọ nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, di n'arum; n'ihi na Jehova etewom manu izì ndi ewedara n'ala ozi ọma; O zitewom ikechi ọnyá ndi obi-ha tiwara etiwa, ikpọsa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, na ikpọsa nmeghepu ulo-nkpọrọ gwa ndi ekere ab͕u;

2. ikpọsa arọ mb͕e ihe madu nātọ Jehova utọ, na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ Chineke-ayi nwere; ikasi ndi nile nēru újú obi;

3. idoro ndi Zaion nēru újú, inye ha ihe ọma ike n'isi n'ọnọdu ntu, manu obi-utọ n'ọnọdu iru-újú, ákwà-nb͕okwasi otuto n'ọnọdu mọ nke inyoghi-inyoghi; ka enwe kpọ ha osisi oak nke ezi omume, ihe-ọkukú nke Jehova, ime ka ọ ma nma.

4. Ha gēwu kwa ebe nile nke bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga; ebe nile nke tọb͕ọrọ n'efu nke ndi mbu ka ha gēwuli, me kwa ka nkpọnkpọ obodo nile di ọhu, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu nke ọtutu ọb͕ọ gara aga.

5. Ndi ala ọzọ gēguzo nāzù ìgwè ewu na aturu-unu, umu ala ọzọ gābu kwa ndi-ọlu-ubi-unu na ndi-ọlu-ubi-vine-unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 61