7. Ìgwè ewu na aturu nile nke Kida ka agāchikọtara gi, ebulu nile nke Nebaiot gējere gi ozi: ha gārigota n'ebe-ichu-àjàm dika ihe nātọ utọ, M'gēme kwa ulo nke ima-nmam ka ọ ma nma.
8. Òle ndi bu ndia nke nēfe efe dika igwe-oji, ndi nēfe kwa dika nduru si eferue window-ha?
9. N'ezie Mu ka agwe-etiti nile gēchere, ub͕ọ nile nke Tashish gēbu kwa uzọ, ime ka umu-gi ndikom si n'ebe di anya bia, ha na ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha, ibiakute aha Jehova, bú Chineke-gi, na ibiakute Onye Nsọ nke Israel, n'ihi na O mewo ka i ma nma.
10. Umu ala ọzọ gēwu kwa mb͕idi-gi nile, ndi-eze-ha gēje-kwa-ra gi ozi: n'ihi na n'iwem ka M'tiworo gi ihe, ma na mb͕e ihe-gi nātọm utọ ka M'nweworo obi-ebere n'aru gi.
11. Ọnu-uzọ-ama-gi nile gēghe kwa oghe mb͕e nile; agaghi-emechi ha n'ehihie ma-ọbu n'abali; ka madu we bubatara gi àkù nke mba di iche iche, ndi-eze-ha aburu kwa ndi anēdu edu.
12. N'ihi na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè gi gāla n'iyì; e, aghaghi ime ka mba ahu nile tọb͕ọrọ n'efu.
13. Ebube Lebanon gābiakute gi, osisi fir na osisi pine na osisi cypress n'otù; ime ka ọnọdu ebe nsọm ma nma, M'gēme kwa ka ọnọdu ukwum abua nwe nsọpuru.
14. Ọzọ, umu nke ndi nēweda gi n'ala gējekuru gi nēruda n'ala; ndi nile nke nēlelì gi anya gākpọ kwa isi ala n'ọbu-ukwu nke ukwu-gi abua; ha gākpọ kwa gi, Obodo Jehova, Zaion nke Onye Nsọ nke Israel.
15. N'onọdu ibu onye arapuru arapu na onye anākpọ asì nke i buworo, nke ọ nādighi onye nāgabiga n'etiti gi, M'gēme gi ka i ghọ nbili-elu ebighi-ebi, na ihe obi-utọ nke ọtutu ọb͕ọ.
16. I gāṅu kwa miri-ara nke mba di iche iche, ọ bu kwa ara ndi-eze ka i gāmi: i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.
17. N'ọnọdu ọla M'gēweta ọla-edo, n'ọnọdu ígwè M'gēweta ọla-ọcha, n'ọnọdu osisi M'gēweta ọla, n'ọnọdu nkume M'gēweta ígwè: M'gēme kwa ka ndi-nlekọta-gi ghọ udo, M'gēme kwa ka ndi nāchi gi n'ihe-ike ghọ ezi omume.
18. Agaghi-anu kwa ihe-ike ọzọ n'ala-gi, agaghi-anu nbibi na ntipia n'ókè-ala-gi nile; ma i gākpọ mb͕idi-gi nile Nzọputa, kpọ kwa ọnu-uzọ-ama-gi nile Otuto.