Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 60:16-22 Bible Nso (IGBOB)

16. I gāṅu kwa miri-ara nke mba di iche iche, ọ bu kwa ara ndi-eze ka i gāmi: i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.

17. N'ọnọdu ọla M'gēweta ọla-edo, n'ọnọdu ígwè M'gēweta ọla-ọcha, n'ọnọdu osisi M'gēweta ọla, n'ọnọdu nkume M'gēweta ígwè: M'gēme kwa ka ndi-nlekọta-gi ghọ udo, M'gēme kwa ka ndi nāchi gi n'ihe-ike ghọ ezi omume.

18. Agaghi-anu kwa ihe-ike ọzọ n'ala-gi, agaghi-anu nbibi na ntipia n'ókè-ala-gi nile; ma i gākpọ mb͕idi-gi nile Nzọputa, kpọ kwa ọnu-uzọ-ama-gi nile Otuto.

19. Anyanwu agaghi-abū-kwa-ra gi ìhè ọzọ n'ehihie; ma n'onwu-maramara ọnwa agaghi-enye gi ìhè: ma Jehova gāghọrọ gi ìhè ebighi-ebi, Chineke-gi gāghọ-kwa-ra gi ima-nma-gi.

20. Anyanwu-gi agaghi-ada kwa ọzọ, ọnwa-gi agaghi-ewepu kwa onwe-ya: n'ihi na Jehova gāghọrọ gi ìhè ebighi-ebi, ubọchi nile nke iru-újú-gi ewe zue ezu.

21. Ndi-gi kwa, ha nile gābu ndi ezi omume, rue mb͕e ebighi-ebi ka ha gēnweta ala; alaka nke ọkukúm, ọlu akam, ime ka M'ma nma.

22. Onye ntà n'etiti ha gāghọ nnù abua na ọgu iri, onye dikarisiri ntà gāghọ kwa mba nwere ume: Mu onwem, Jehova, gēme ka ọ bia ọsọsọ na mb͕e-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 60