Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 60:15-19 Bible Nso (IGBOB)

15. N'onọdu ibu onye arapuru arapu na onye anākpọ asì nke i buworo, nke ọ nādighi onye nāgabiga n'etiti gi, M'gēme gi ka i ghọ nbili-elu ebighi-ebi, na ihe obi-utọ nke ọtutu ọb͕ọ.

16. I gāṅu kwa miri-ara nke mba di iche iche, ọ bu kwa ara ndi-eze ka i gāmi: i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.

17. N'ọnọdu ọla M'gēweta ọla-edo, n'ọnọdu ígwè M'gēweta ọla-ọcha, n'ọnọdu osisi M'gēweta ọla, n'ọnọdu nkume M'gēweta ígwè: M'gēme kwa ka ndi-nlekọta-gi ghọ udo, M'gēme kwa ka ndi nāchi gi n'ihe-ike ghọ ezi omume.

18. Agaghi-anu kwa ihe-ike ọzọ n'ala-gi, agaghi-anu nbibi na ntipia n'ókè-ala-gi nile; ma i gākpọ mb͕idi-gi nile Nzọputa, kpọ kwa ọnu-uzọ-ama-gi nile Otuto.

19. Anyanwu agaghi-abū-kwa-ra gi ìhè ọzọ n'ehihie; ma n'onwu-maramara ọnwa agaghi-enye gi ìhè: ma Jehova gāghọrọ gi ìhè ebighi-ebi, Chineke-gi gāghọ-kwa-ra gi ima-nma-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 60