Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 60:10-14 Bible Nso (IGBOB)

10. Umu ala ọzọ gēwu kwa mb͕idi-gi nile, ndi-eze-ha gēje-kwa-ra gi ozi: n'ihi na n'iwem ka M'tiworo gi ihe, ma na mb͕e ihe-gi nātọm utọ ka M'nweworo obi-ebere n'aru gi.

11. Ọnu-uzọ-ama-gi nile gēghe kwa oghe mb͕e nile; agaghi-emechi ha n'ehihie ma-ọbu n'abali; ka madu we bubatara gi àkù nke mba di iche iche, ndi-eze-ha aburu kwa ndi anēdu edu.

12. N'ihi na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè gi gāla n'iyì; e, aghaghi ime ka mba ahu nile tọb͕ọrọ n'efu.

13. Ebube Lebanon gābiakute gi, osisi fir na osisi pine na osisi cypress n'otù; ime ka ọnọdu ebe nsọm ma nma, M'gēme kwa ka ọnọdu ukwum abua nwe nsọpuru.

14. Ọzọ, umu nke ndi nēweda gi n'ala gējekuru gi nēruda n'ala; ndi nile nke nēlelì gi anya gākpọ kwa isi ala n'ọbu-ukwu nke ukwu-gi abua; ha gākpọ kwa gi, Obodo Jehova, Zaion nke Onye Nsọ nke Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 60