Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 58:11-14 Bible Nso (IGBOB)

11. Jehova ganēdu kwa gi mb͕e nile, me ka afọ ju nkpuru-obi-gi n'ebe nile nkpọrọ nku, Ọ gēme kwa ka ọkpukpu-gi nile di ike; i gādi kwa ha ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma, di kwa ka ebe miri nāsuputa nke miri-ya nādighi-ata ata.

12. Ndi gēsi n'aru-gi puta gēwu kwa ebe nile bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: ntọ-ala nke ọtutu ọb͕ọ ka i gēwuli; agākpọ kwa gi Onye-nmechi ntipú, Onye-nkwazi okporo-uzọ ibi ebi.

13. Ọ buru na i me ka ukwu-gi si n'ubọchi-izu-ike chighari, i we ghara ime ihe nātọ gi utọ n'ubọchi nsọm; ọ buru kwa na i kpọ ubọchi-izu-ike ihe-utọ, i kpọ kwa ihe nsọ nke Jehova ihe-nsọpuru; i we sọpuru ya, ghara ime ihe bu uzọ-gi nile, ghara ichọputa ihe nātọ gi utọ ma-ọbu ikwu okwu nke aka gi:

14. mb͕e ahu ihe Jehova gātọ gi utọ; M'gēme kwa ka i nọkwasi ebe nile di elu nke uwa dika inyinya; M'gēme kwa ka i rie ihe-nketa nke Jekob, bú nna-gi: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 58