Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 58:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Were akpiri kpọ nkpu, eb͕ochila, welie olu-gi dika opì-ike, we gosi ndim njehie-ha, gosi kwa ulo Jekob nmehie-ha.

2. Ma Mu ka ha nāchọ kwa-ubọchi, imara uzọm nile nātọ kwa ha utọ: dika mba nke mere ezi omume, nke nārapughi kwa ikpé nke Chineke-ha, ha nāriọm ikpé nile nke ezi omume, ibiaru Chineke nso nātọ ha utọ.

3. Ha si, N'ìhi gini ka ayi būworo ọnu, ma I hughi? n'ìhi gini ka ayi wedaworo nkpuru-obi-ayi n'ala, ma I dighi-ama? Le, n'ubọchi obubu-ọnu-unu unu nāchọputa ihe nātọ unu utọ, ọ bu kwa ihe nile nke putara na ndọb͕u ndi-ọlu-unu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu ka unu nānara n'ihe-ike.

4. Le, ọ bu n'ihi ise-okwu na ilu-ọ̀gù ka unu nēbu ọnu, ya na iwere ọkpọ nke nmebi-iwu tib͕ue: unu adighi-ebu ọnu dika ta ime ka anuru olu-unu n'elu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 58