Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 57:7-18 Bible Nso (IGBOB)

7. N'elu ugwu di elu, nke eme-kwa-ra ka ọ di elu, ka i doworo ihe-ndina-gi: ọ bu kwa n'ebe ahu ka i rigoro ichu àjà.

8. Ọ bu kwa n'azu ọnu-uzọ-gi na akuku-ọnu-uzọ-gi ka i doworo ihe-ncheta-gi: n'ihi na mb͕e M'nānọghi ka i kpupuru ihe-ndina-gi, we rigo: i mere ka ihe-ndina-gi sa mbara, we soro ha b͕ara onwe-gi ndu; i huru ihe-ndina-ha n'anya; aka-ha ka i huru.

9. I we were manu jegharikuru eze ahu, i me-kwa-ra manu-otite-gi nēsì ísì utọ ka ha ba uba, i zi-kwa-ra ndi-ukọ-gi n'ebe di anya, i we me onwe-gi ka i di ala rue ala-mọ.

10. N'iba-uba nke uzọ-gi ka ike gwusiri gi; i sighi, Ntukwasi-obi adigh: ndu aka-gi ka i chọtara; n'ihi ya i riaghi ọria.

11. Ma ònye ka i cheb͕uworo onwe-gi bayere ya, we tua egwu ya, na i nēkwu okwu-ugha, we ghara ichetam, ghara kwa itiye ya n'obi-gi? Mù onwem adighi-ab͕a nkiti ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, i we ghara itu egwum?

12. Mu onwem gēgosi ezi omume-gi; ma ọlu-gi nile, ha agaghi-abara gi urù.

13. Mb͕e i nēti nkpu, ka ndi i chikọtaworo naputa gi; ma ha nile ka ifufe gēfepu, otù nku-ume gēkupu ha: ma onye ahu nke nab͕abà nimem gēketa ala, nweta kwa ugwu nsọm.

14. Ọ gāsi kwa, Tulienu, tulienu, dozienu uzọ, bupunu ihe-isu-ngọngọ n'uzọ ndim.

15. N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu.

16. N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gānalu ọ̀gù, ọ bughi kwa rue mb͕e nile ka M'ganēwe iwe: n'ihi na mọ gāda #mbà n'irum, ya na nkpuru-obi nile Mu onwem meworo.

17. N'ihi ajọ omume nke urù-ya ka M'were iwe, we tie ya ihe, nēzobe irum nēwe kwa iwe: o we nāga nēchighari azu n'uzọ nke obi-ya.

18. Uzọ-ya nile ka M'huworo, M'gēme kwa ka aru di ya ike: M'gēdu kwa ya, nyeghachi ya nkasi-obi nile, nyeghachi kwa ndi-ya nēru újú.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 57