Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 57:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye ezi omume nāla n'iyì, ma ọ dighi onye ọ bula nētiye ya n'obi-ya; anēkpochapu kwa ndi-ebere, mb͕e ọ nādighi onye nāghọta na ekpochapuworo onye ezi omume n'iru ihe ọjọ.

2. Ọ nābà n'udo; ha nēzu ike n'elu ihe-ndina-ya, onye ọ bula nke nāgazi agazi.

3. Ma unu onwe-unu, biaruenu nso ebe a, unu umu-ndikom nke nwanyi ji igwe-oji atu isi ọma na isi ọjọ, unu nkpuru nke nwoke nākwa iko na nwanyi nākwa iko.

4. Ònye ka ọ nātọ unu utọ imegide? ònye ka unu nāsaghepu ọnu mbara, riputasi kwa ire, imegide? ùnu onwe-unu abughi umu njehie, nkpuru okwu-ugha,

5. unu ndi nēme onwe-unu ka unu di ọku n'etiti osisi terebinth, n'okpuru osisi ndu ọ bula; ndi nēb͕u umu-unu na ndagwurugwu nile n'okpuru nb͕awa nke nkume nile di elu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 57