Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 52:5-9 Bible Nso (IGBOB)

5. Ma ub͕u a, gini ka M'nwere ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ewepuwo ndim n'efu? ndi nāchi ha nākwasi ákwá ike, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa mb͕e nile n'ogologo ubọchi nile ka anēlelì aham.

6. N'ihi nka ka ndim gāmara aham: n'ihi nka ka ha gāmara n'ubọchi ahu na Mu onwem bu Onye ahu Nke nēkwu okwu; lekwam.

7. Le, ka ha si ma nma nke-uku n'elu ugwu, bú ukwu nke onye nēzisa ozi ọma, bú onye nēme ka anuru okwu udo, onye nēzisa ozi ọma nke ezi ihe, onye nēme ka anuru okwu nzọputa; onye nāsi Zaion, Chineke-gi bu eze!

8. Nuru olu ndi-nche-gi! ha eweliwo olu-ha, n'otù ka ha nētikọ nkpu ọṅù; n'ihi na anya na anya ka ha gāhu mb͕e Jehova nālaghachikute Zaion.

9. Tiwanu nkpu ọṅù, tienu nkpu ọṅù n'ọtù, unu nkpọnkpọ ebe nke Jerusalem: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ b͕aputawo Jerusalem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 52