Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 50:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Otú a ka Jehova siri, Òle ebe akwukwọ nkwa nke nne-unu di, bú nke M'ji chupu ya? ma-ọbu ònye nime ndi M'nara ego n'ọmuru-nwa ka M'reworo unu n'aka ya? Le, ọ bu n'ihi ajọ omume nile nke unu ka erere unu, ọ bu kwa n'ihi njehie nile nke unu ka achupuru nne-unu.

2. Gini mere onye ọ bula adighi mb͕e M'biara? gini mere onye-ọziza adighi mb͕e M'kpọrọ òkù? ọ̀ bu na akam dikara nkpunkpu ma-ọli ib͕aputa? ma-ọbu ọ̀ dighi ike di nimem inaputa? Le, n'ibasi-nba-ikem anameme ka oké osimiri tasia, anameme osimiri ka ha ghọ ọzara: azù-ha nēsì ísì, n'ihi na miri adighi, we nwua n'akpiri-ikpọ-nku.

3. Ejim iji-nji yikwasi elu-igwe dika uwe, ọ bu kwa akwà-nkpe ka M'nēme ka ọ buru ihe-nb͕okwasi-ha.

4. Onye-nwe-ayi, bú Jehova, enyewom ire nke ndi-nmuta, ka m'we mara iwere okwu kwagide onye dara #mbà: Ọ nākpọte ntim kwa-ututu, Ọ nākpọte ntim inu ihe dika ndi-nmuta.

5. Onye-nwe-ayi Jehova emegheworom ntim, ma Mu onwem enupugh isi, alaghachighm azu.

6. Azum ka m'nyere ndi-oti-ihe, ǹtìm abua ka m'nyere ndi nēkwopu afu-ọnu: ezopughm irum n'ọnọdu-ihere anētiyem na ọbubú-ọnu.

7. Ma Onye-nwe-ayi Jehova nēyerem aka; n'ihi nka etiyeghm n'ọnọdu-ihere: n'ihi nka ka m'cheworo irum dika ọmú, ama-kwa-ram na ihere agaghi-emem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 50