Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 5:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Biko, ka m'bùara onye ihe-ya nātọm utọ nke-uku abù nke onye ihe-ya nātọm utọ bayere ubi-vine-ya. Onye ihe-ya nātọm utọ nke-uku nwere ubi-vine n'ugwu ntà nke bu ezi oké ala:

2. o we gwue ya, tutupu nkume-ya nile, kua osisi vine kachasi nma nime ya, wue ulo-elu n'etiti ya, waputa kwa ebe-inara-manya-vine nime ya: o we le anya na ọ gāmi nkpuru-vine, ma ọ miri nkpuru-vine ọhia.

3. Ma ub͕u a, unu ndi bi na Jerusalem na ndi Juda, biko, kpenu ikpe n'etiti mu na ubi-vine nkem.

4. Gini ka agēme ubi-vine nkem ọzọ, nke m'nēmeghi nime ya? gini mere, mb͕e m'lere anya na ọ gāmi nkpuru-vine, o ji mia nkpuru-vine ọhia?

5. Ma ub͕u a, biko, ka m'me ka unu mara ihe mu onwem gaje ime ubi-vine nkem: m'gēwezuga ogige-ya, o we ghọ ebe anu-ulo nāta nri; m'gētipia mb͕idi-ya, o we ghọ ebe anāzọtọ:

6. m'gēme kwa ka ọ gwusia; agaghi-akwacha vine-ya, agaghi-edozi kwa ya; ma ogwu na uke gētoputa: igwe-oji nile ka m'gēnye kwa iwu ka ha ghara izokwasi ya miri.

7. N'ihi na ubi-vine nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu ulo Israel, ndi Juda bu kwa ihe-ọkukú nātọ Ya utọ nke-uku: O we le anya ikpe ziri ezi, ma, le, nwusi-ọbara; O lere anya ezi omume, ma, le, iti-nkpu.

8. Ahuhu gādiri ndi nātukwasi ulo n'ulo, ndi nēme ka ubi rue ubi nso, rue mb͕e ọnọdu adighi kwa ọzọ, ewe me ka nání unu biri n'etiti ala!

9. Na ntim abua ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, N'ezie ọtutu ulo gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ulo uku nke bu kwa ezi ulo, nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha.

10. N'ihi na ala ubi-vine nke madu gēji ehi abua alu n'ubọchi iri gēweputa nání otù ihe-ọtùtù bath nke manya-vine, ọzọ, otù ihe-ọtùtù homer nke nkpuru-ọghigha gāmi nání otù ihe-ọtùtù ephah.

11. Ahuhu gādiri ndi nēbili n'isi-ututu ib͕aso ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ndi nānọ ogologo mb͕e n'anyasi, manya-vine ewe me ka aru nwuru ha ọku.

12. Ubọ-akwara na une na egwú-otiti na ọ̀jà na manya-vine di kwa n'ọṅuṅu-manya-vine-ha nile: ma ha adighi-elegide ọlu Jehova anya, ha ahughi kwa ihe aka-Ya abua nēme.

13. N'ihi nka ndim ejewo biri n'ala ọzọ, site n'amaghi-ama: ndi-nsọpuru-ha bu kwa ndi agu nāgub͕u, ìgwè-ha bu kwa ndi akpiri miri nākpọsi nku ike.

14. N'ihi nka ala-mọ emewo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara, ọ saghebigawo kwa ọnu-ya ókè: ima-nma Jerusalem, na ìgwè-ya, na nkpọtu-ya, na onye nāṅuri ọṅu-agha n'etiti ya, gārida kwa nime ya.

15. Onye di ala we ruda n'ala, onye di elu nēme kwa onwe-ya ka ọ di ala, anēme kwa anya abua nke ndi di elu ka ha di ala:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 5