Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 49:6-22 Bible Nso (IGBOB)

6. O we si, Ọ bu ihe di kari nfe na i gāburum orù, ime ka ebo nile nke Jekob bilie, na ime ka ndi Israel echebere echebe lata: enyewokwam i ka i buru ìhè nke mba nile, ibu nzọputam rue nsọtu uwa.

7. Otú a ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa Israel na Onye Nsọ ya, siri onye madu nēleda, onye bu ihe-árú nke mba nka, onye bu orù ndi nāchi achi: Ndi-eze gāhu, we kpọ isi ala; n'ihi Jehova Nke kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye Nsọ nke Israel, Nke rọputaworo gi.

8. Otú a ka Jehova siri, Na mb͕e ihe madu nātọm utọ ka M'zaworo gi, ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'nyeworo gi aka: M'gēchebe kwa gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ime ka ala bilie, ime ka ha keta ihe-nketa nile tọb͕ọrọ n'efu;

9. nāsi ndi ekere ab͕u, Puanu; nāsi ndi nọ n'ọchichiri, Putanu n'ìhè. N'uzọ nile ka ha gāzù onwe-ha, ọ bu kwa n'ugwu nile ọhia nādighi ka ebe-ita-nri-ha gādi.

10. Agu agaghi-agu ha, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku; miri na anyanwu agaghi-amab͕u kwa ha: n'ihi na Onye nwere obi-ebere n'aru ha gēdu ha, ọ bu kwa n'akuku isi-iyi nile juputara na miri ka O gēdu ha nwayọ.

11. M'gēme kwa ka ugwum nile ghọ uzọ, agēme kwa ka uzọm nile atuliri atuli di elu.

12. Le, ndia gēsi n'ebe di anya bia: le kwa, ndia gēsi n'Ugwu na n'Ọdida-anyanwu; ndia gēsi kwa n'ala Sainim.

13. Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe; tegharia egwú ọṅù, gi uwa; tiwanu nkpu ọṅù, unu ugwu: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ndi-Ya ewedara n'ala.

14. Ma Zaion siri, Jehova arapuwom, Onye-nwe-ayi echezọwokwam.

15. Nwanyi, ọ̀ gēchezọ nwa-ya nāṅu ara, we ghara inwe obi-ebere n'aru nwa afọ-ya? e, eleghi anya ndia gēchezọ, ma Mu onwem agaghi-echezọ gi.

16. Le, n'ọbu-akam abua ka M'kàworo gi àkà; mb͕idi-gi nile di n'irum mb͕e nile.

17. Umu-gi emewo ngwa; ndi nākwada gi na ndi nēme ka i tọb͕ọrọ n'efu gēsi nime gi pua.

18. Welie anya-gi abua le buruburu, we hu: ndia nile achikọtawo onwe-ha, biakute gi. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta,) n'ezie ha nile ka i gēyiri dika ihe-ichọ-nma, were ha ke, dika nwunye ọhu.

19. N'ihi na, nkpọnkpọ ebe-gi nile na ebe-gi nile tọb͕ọrọ n'efu na ala-gi akwadara akwada, n'ezie ub͕u a i gādikara ndi bi n'ala nkpà, ndi nēloda gi gānọ kwa n'ebe di anya.

20. Umu nke mb͕e ọb͕ub͕a-aka-umu-gi gāsi kwa na nti-gi abua ọzọ, Ebe a dim nkpà: nyem ọnọdu ka m'we biri.

21. I gāsi kwa n'obi-gi, Ònye muru ndia nyem, ebe mu onwem bu onye ab͕abaworo aka umu, na nwanyi-àgà, na onye emeworo ka ọ je biri n'ala ọzọ, na onye ewezugara ewezuga? ma ndia, ònye mere ka ha toputa? Le, mu onwem fọduru, náním; ndia, òle ebe ha nọ?

22. Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri, Le, M'gēweliri mba nile akam, ọ bu kwa ndi di iche iche ka m'gēbuliri ọkọlọtọm: ha gēkuta kwa umu-gi ndikom n'obi-ha, agēbu kwa umu-gi ndinyom n'ubu-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 49