Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 49:20-26 Bible Nso (IGBOB)

20. Umu nke mb͕e ọb͕ub͕a-aka-umu-gi gāsi kwa na nti-gi abua ọzọ, Ebe a dim nkpà: nyem ọnọdu ka m'we biri.

21. I gāsi kwa n'obi-gi, Ònye muru ndia nyem, ebe mu onwem bu onye ab͕abaworo aka umu, na nwanyi-àgà, na onye emeworo ka ọ je biri n'ala ọzọ, na onye ewezugara ewezuga? ma ndia, ònye mere ka ha toputa? Le, mu onwem fọduru, náním; ndia, òle ebe ha nọ?

22. Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri, Le, M'gēweliri mba nile akam, ọ bu kwa ndi di iche iche ka m'gēbuliri ọkọlọtọm: ha gēkuta kwa umu-gi ndikom n'obi-ha, agēbu kwa umu-gi ndinyom n'ubu-ha.

23. Ndi-eze gābu kwa nna nāzù umu-gi, ndi-eze-nwanyi-ha gābu kwa ndinyom nēnye umu-gi ara: ha gākpọ isi ala nye gi, kpue iru-ha n'ala, racha ájá ukwu-gi abua; i we mara na Mu onwem bu Jehova, Onye ihere agaghi-eme ndi nēle anyam.

24. Àgānara dike ihe o wetara n'agha, ma-ọbu ndi onye ezi omume dọtara n'agha, àgēme ka ha wepuga onwe-ha?

25. Ma otú a ka Jehova siri, Ọbuná ndi dike dọtara n'agha ka agēwepu, ọzọ, ihe onye nēme ka madu ma jijiji wetara n'agha, agēme ya ka ọ wepuga onwe-ya; ọ bu kwa onye nāluso gi ọ̀gù, ọ bu kwa umu-gi ka Mu onwem gāzọputa.

26. M'gēme kwa ka ndi nēme gi ihe-ike rie anu-aru onwe-ha: ha gāṅubiga kwa ọbara onwe-ha ókè, dika ọ bu manya-vine ọhu: anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi, na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 49