Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 49:14-24 Bible Nso (IGBOB)

14. Ma Zaion siri, Jehova arapuwom, Onye-nwe-ayi echezọwokwam.

15. Nwanyi, ọ̀ gēchezọ nwa-ya nāṅu ara, we ghara inwe obi-ebere n'aru nwa afọ-ya? e, eleghi anya ndia gēchezọ, ma Mu onwem agaghi-echezọ gi.

16. Le, n'ọbu-akam abua ka M'kàworo gi àkà; mb͕idi-gi nile di n'irum mb͕e nile.

17. Umu-gi emewo ngwa; ndi nākwada gi na ndi nēme ka i tọb͕ọrọ n'efu gēsi nime gi pua.

18. Welie anya-gi abua le buruburu, we hu: ndia nile achikọtawo onwe-ha, biakute gi. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta,) n'ezie ha nile ka i gēyiri dika ihe-ichọ-nma, were ha ke, dika nwunye ọhu.

19. N'ihi na, nkpọnkpọ ebe-gi nile na ebe-gi nile tọb͕ọrọ n'efu na ala-gi akwadara akwada, n'ezie ub͕u a i gādikara ndi bi n'ala nkpà, ndi nēloda gi gānọ kwa n'ebe di anya.

20. Umu nke mb͕e ọb͕ub͕a-aka-umu-gi gāsi kwa na nti-gi abua ọzọ, Ebe a dim nkpà: nyem ọnọdu ka m'we biri.

21. I gāsi kwa n'obi-gi, Ònye muru ndia nyem, ebe mu onwem bu onye ab͕abaworo aka umu, na nwanyi-àgà, na onye emeworo ka ọ je biri n'ala ọzọ, na onye ewezugara ewezuga? ma ndia, ònye mere ka ha toputa? Le, mu onwem fọduru, náním; ndia, òle ebe ha nọ?

22. Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri, Le, M'gēweliri mba nile akam, ọ bu kwa ndi di iche iche ka m'gēbuliri ọkọlọtọm: ha gēkuta kwa umu-gi ndikom n'obi-ha, agēbu kwa umu-gi ndinyom n'ubu-ha.

23. Ndi-eze gābu kwa nna nāzù umu-gi, ndi-eze-nwanyi-ha gābu kwa ndinyom nēnye umu-gi ara: ha gākpọ isi ala nye gi, kpue iru-ha n'ala, racha ájá ukwu-gi abua; i we mara na Mu onwem bu Jehova, Onye ihere agaghi-eme ndi nēle anyam.

24. Àgānara dike ihe o wetara n'agha, ma-ọbu ndi onye ezi omume dọtara n'agha, àgēme ka ha wepuga onwe-ha?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 49