Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 49:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Genum nti, unu agwe-etiti; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi di iche iche, site n'ebe di anya: Jehova esitewo na mb͕e m'nọ n'afọ kpọm; site na mb͕e m'nọ n'afọ nnem ka O hotaworo aham:

2. O we me ka ọnum di ka mma-agha di nkọ, na ǹdò aka-Ya ka O zobeworom; O we me ka m'ghọ àmùmà, n'àkpà-àkú-Ya ka O zebeworom:

3. O we sim, Orùm ka i bu; gi Israel, onye ọ bu nime gi ka M'gēme Onwem ka M'ma nma.

4. Ma mu onwem siri, N'efu ka m'dọb͕uworo onwem n'ọlu, n'ihi ihe tọb͕ọrọ n'efu na otù nku-ume ka m'meworo ka ikem gwusia: n'ezie ikpém di n'aka Jehova, ugwọ-ọlum di kwa n'aka Chinekem.

5. Ma ub͕u a Jehova siri, bú Onye kpuworom site n'afọ nnem iburu Ya orù, ime ka Jekob laghachikute Ya, ka ewe chikọta-kwa-ra Ya Israel: (anāsọpu-kwa-ram n'anya Jehova, Chinekem aghọwo ikem:)

6. O we si, Ọ bu ihe di kari nfe na i gāburum orù, ime ka ebo nile nke Jekob bilie, na ime ka ndi Israel echebere echebe lata: enyewokwam i ka i buru ìhè nke mba nile, ibu nzọputam rue nsọtu uwa.

7. Otú a ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa Israel na Onye Nsọ ya, siri onye madu nēleda, onye bu ihe-árú nke mba nka, onye bu orù ndi nāchi achi: Ndi-eze gāhu, we kpọ isi ala; n'ihi Jehova Nke kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye Nsọ nke Israel, Nke rọputaworo gi.

8. Otú a ka Jehova siri, Na mb͕e ihe madu nātọm utọ ka M'zaworo gi, ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'nyeworo gi aka: M'gēchebe kwa gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ime ka ala bilie, ime ka ha keta ihe-nketa nile tọb͕ọrọ n'efu;

9. nāsi ndi ekere ab͕u, Puanu; nāsi ndi nọ n'ọchichiri, Putanu n'ìhè. N'uzọ nile ka ha gāzù onwe-ha, ọ bu kwa n'ugwu nile ọhia nādighi ka ebe-ita-nri-ha gādi.

10. Agu agaghi-agu ha, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku; miri na anyanwu agaghi-amab͕u kwa ha: n'ihi na Onye nwere obi-ebere n'aru ha gēdu ha, ọ bu kwa n'akuku isi-iyi nile juputara na miri ka O gēdu ha nwayọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 49