Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 45:6-16 Bible Nso (IGBOB)

6. ka ha we mara site n'ọwuwa anyanwu, site kwa n'Ọdida-anyanwu, na ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli ma ewezuga náním: Mu onwem bu Jehova, ọ dighi kwa onye ọzọ di.

7. Abum Onye nākpu ìhè na Onye nēkè ọchichiri; abum Onye nēme udo na Onye nēkè ihe ọjọ: Mu onwem bu Jehova, Onye nēme ihe ndia nile.

8. Unu elu-igwe, nātasinu ezi omume site n'elu, ka mbara-ígwé nile nēzoda kwa ezi omume dika miri: ka ala meghe onwe-ya, ka ha we mia nzọputa dika nkpuru, ka o me kwa ezi omume ka ọ pukọ n'otù; Mu onwem, bú Jehova, ekèwo ya.

9. Ahuhu gādiri onye nāluso Onye kpuworo ya ọ̀gù! otù ejùjù nile nke ala! Urọ, ọ̀ gāsi onye nākpu ya, Gini ka i nālu? ma-ọbu ọlu-gi, ọ̀ gasi, Ọ dighi aka abua o nwere?

10. Ahuhu gādiri onye nāsi nna-ya, Gini ka i nāmu? nke nāsi kwa nwanyi, Ìme gini nēme gi?

11. Otú a ka Jehova siri, bú Onye Nsọ nke Israel na Onye kpuworo ya: Juanum ajuju bayere ihe nile nābia; nyenum iwu bayere umum, ma-ọbu bayere ọlu akam abua.

12. Mu onwem emewo uwa, kè kwa madu n'elu ya: Mu onwem, akam abua setiri elu-igwe, ọ bu usu nile nke ihe-ha M'nyeworo iwu.

13. Mu onwem akpọtewo ya n'ezi omume, ọ bu kwa uzọ-ya nile ka M'gēme ka ha guzozie: onye ahu gēwu obodom, zilaga ndim emereri ka ha je biri n'ala ọzọ, ọ bughi n'ihi ọnu-ahia, ọ bughi kwa n'ihi iri-ngo, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

14. Otú a ka Jehova siri, Ihe putara na ndọb͕u Ijipt nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ọzuzu-ahia nke Etiopia, na ndi Saba, ndi toro ogologo, gāgabigakute gi, ndi i nwere ka ha gābu kwa; gi ka ha gēso n'azu; na nkpọrọ ka ha gāgabiga: ọ bu kwa gi ka ha gākpọ isi ala nye, gi ka ha gēkpere, si, N'ezie nime gi ka Chineke nọ; ọ dighi kwa onye ọzọ di, ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli.

15. N'ezie Gi onwe-gi bu Chineke Nke nēzobe Onwe-gi, Gi Chineke Israel, bú Onye-nzọputa.

16. Ihere emewo ha, e, etiyewo kwa ha n'ọnọdu-ihere, ha nile: n'otù ka ha lakọworo n'ọnọdu-ihere, bú ndi-ọ̀kà nēb͕u arusi eb͕uru eb͕ubu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 45