Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 42:8-17 Bible Nso (IGBOB)

8. Mu onwem bu Jehova; nke ahu bu aham: M'gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum, M'gaghi-enye kwa arusi di iche iche apiri api otutom.

9. Ihe mbu, le, ha abiawo, ọ bu kwa ihe ọhu di iche iche ka Mu onwem nēgosi: tutu ha epue anameme ka unu nuru ha.

10. Bùkuenu Jehova abù ọhu, kwusanu otuto-Ya site na nsọtu uwa; unu ndi nārida n'oké osimiri, na ùjú-ya, agwe-etiti nile, na ndi bi ha.

11. Ka ọzara na obodo-ya nile welie olu-ha, obodo ntà nile Kida bi: ka ndi bi na Sela tie nkpu ọṅù, ka ha si n'elu ugwu nile tisie nkpu ike.

12. Ka ha nye Jehova nsọpuru, gosi kwa otuto-Ya n'agwe-etiti nile.

13. Jehova gāputa dika dike; dika onye-agha ka Ọ gākpọte ekworo: Ọ gēti nkpu agha, e, Ọ gēti oké nkpu agha; n'imegide ndi-iro-Ya ka Ọ nēme Onwe-ya dike.

14. Edebewom ọnum du site na mb͕e ebighi-ebi gara aga; anamab͕a nkiti, jisie onwem ike: dika nwanyi ime neme, otú a ka M'gāsu, udè, ku ume ngwa ngwa, Kusie ume ike n'otù.

15. M'gēme ugwu na ugwu ntà ka ha kọ akọ, ihe-ọkukú-ha nile ka M'gēme kwa ka ọ kpọnwua; M'gēme kwa osimiri ka ha ghọ agwe-etiti, me kwa ka ọ̀dọ-miri nile takọ.

16. M'ga-eme kwa ka ndi-ìsì je ije n'uzọ ha nāmaghi; n'okporo-uzọ ha nāmaghi ka M'gēme ka ọchichiri buru ìhè n'iru ha, me kwa ebe b͕agọrọ ab͕agọ ka ha guzozie. Ihe ndia ka M'gēme, M'gaghi-arapu kwa ha.

17. Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha nke-uku, bú ndi nātukwasi arusi nile apiri api obi, ndi nāsi arusi awuru awu, Unu onwe-unu bu chi-ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 42