Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 42:5-20 Bible Nso (IGBOB)

5. Otú a ka Chineke, bú Jehova, siri, bú Onye kèworo elu-igwe, seti kwa ha; Onye meworo uwa na ihe nile nke si nime ya aputa ka ọ sa mbara; Onye nēnye ndi bi n'elu ya ume ha nēku, Onye nēnye kwa ndi nējeghari nime ya mọ:

6. Mu onwem, bú Jehova, akpọwo gi n'ezi omume, M'gējide kwa aka-gi, chebe gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ka i buru kwa ìhè nke mba nile;

7. imeghe anya nile kpuru ìsì, ime ka onye-nkpọrọ si n'ebe emechibidoworo ya puta, ime ka ndi nānọdu n'ọchichiri si n'ulo-nkpọrọ puta.

8. Mu onwem bu Jehova; nke ahu bu aham: M'gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum, M'gaghi-enye kwa arusi di iche iche apiri api otutom.

9. Ihe mbu, le, ha abiawo, ọ bu kwa ihe ọhu di iche iche ka Mu onwem nēgosi: tutu ha epue anameme ka unu nuru ha.

10. Bùkuenu Jehova abù ọhu, kwusanu otuto-Ya site na nsọtu uwa; unu ndi nārida n'oké osimiri, na ùjú-ya, agwe-etiti nile, na ndi bi ha.

11. Ka ọzara na obodo-ya nile welie olu-ha, obodo ntà nile Kida bi: ka ndi bi na Sela tie nkpu ọṅù, ka ha si n'elu ugwu nile tisie nkpu ike.

12. Ka ha nye Jehova nsọpuru, gosi kwa otuto-Ya n'agwe-etiti nile.

13. Jehova gāputa dika dike; dika onye-agha ka Ọ gākpọte ekworo: Ọ gēti nkpu agha, e, Ọ gēti oké nkpu agha; n'imegide ndi-iro-Ya ka Ọ nēme Onwe-ya dike.

14. Edebewom ọnum du site na mb͕e ebighi-ebi gara aga; anamab͕a nkiti, jisie onwem ike: dika nwanyi ime neme, otú a ka M'gāsu, udè, ku ume ngwa ngwa, Kusie ume ike n'otù.

15. M'gēme ugwu na ugwu ntà ka ha kọ akọ, ihe-ọkukú-ha nile ka M'gēme kwa ka ọ kpọnwua; M'gēme kwa osimiri ka ha ghọ agwe-etiti, me kwa ka ọ̀dọ-miri nile takọ.

16. M'ga-eme kwa ka ndi-ìsì je ije n'uzọ ha nāmaghi; n'okporo-uzọ ha nāmaghi ka M'gēme ka ọchichiri buru ìhè n'iru ha, me kwa ebe b͕agọrọ ab͕agọ ka ha guzozie. Ihe ndia ka M'gēme, M'gaghi-arapu kwa ha.

17. Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha nke-uku, bú ndi nātukwasi arusi nile apiri api obi, ndi nāsi arusi awuru awu, Unu onwe-unu bu chi-ayi.

18. Unu ndi nti chiri, nurunu; unu ndi-ìsì kwa legidenu anya, ka unu we hu uzọ.

19. Ònye kpuru ìsì, ma-ọbughi orùm, ma-ọbu ònye ka nti chiri, dika onye-ozim M'nēziga? ònye kpuru ìsì dika onye Mu na ya di n'udo, ma-ọbu ònye kpuru ìsì dika orù Jehova?

20. I huwo ọtutu ihe, ma i dighi-ariba ama; nti-ya abua ghere oghe, ma ọ dighi-anu ihe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 42