Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 42:16-25 Bible Nso (IGBOB)

16. M'ga-eme kwa ka ndi-ìsì je ije n'uzọ ha nāmaghi; n'okporo-uzọ ha nāmaghi ka M'gēme ka ọchichiri buru ìhè n'iru ha, me kwa ebe b͕agọrọ ab͕agọ ka ha guzozie. Ihe ndia ka M'gēme, M'gaghi-arapu kwa ha.

17. Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha nke-uku, bú ndi nātukwasi arusi nile apiri api obi, ndi nāsi arusi awuru awu, Unu onwe-unu bu chi-ayi.

18. Unu ndi nti chiri, nurunu; unu ndi-ìsì kwa legidenu anya, ka unu we hu uzọ.

19. Ònye kpuru ìsì, ma-ọbughi orùm, ma-ọbu ònye ka nti chiri, dika onye-ozim M'nēziga? ònye kpuru ìsì dika onye Mu na ya di n'udo, ma-ọbu ònye kpuru ìsì dika orù Jehova?

20. I huwo ọtutu ihe, ma i dighi-ariba ama; nti-ya abua ghere oghe, ma ọ dighi-anu ihe.

21. Ọ tọrọ Jehova utọ, n'ihi, ezi omume-Ya, ime ka iwu-Ya di uku, na ime ka ọ di ebube.

22. Ma ndi nka bu ndi alutaworo ihe-ha n'agha na ndi apunaraworo ha ihe; ha adawo n'ib͕udu n'olùlù, ha nile, ọ bu kwa n'ulo-nkpọrọ di iche iche ka ezobeworo ha: ha aghọwo ihe-nluta-n'agha, ma ọ dighi onye-nnaputa; ha aghọwo ihe apunaraworo madu, ma ọ dighi onye nāsi, Nyeghachi.

23. Ònye n'etiti unu gēge nti na nka? ònye gāṅa nti, we nu ihe n'ọdi-n'iru?

24. Ònye were Jekob nye ka ọ ghọ ihe apunaraworo madu, were Israel nye ndi nāluta ihe n'agha? ọ̀ bughi Jehova? bú Onye ayi mehieworo megide, Onye ha nēkweghi kwa eje ije n'uzọ-Ya nile, ha egeghi kwa nti iwu-Ya.

25. O we wukwasi ya ọnuma nke iwe-Ya, na ike nke agha; nke ahu we suye ya ọku buruburu, ma ọ maghi; o we re ya ọku, ma ọ dighi-atughari obi-ya na ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 42