Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 42:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Le orùm, onye M'nējide aka; onye nkem M'rọputara, onye ihe-ya tọrọ nkpuru-obim utọ: atukwasiwom ya Mọm; ikpé ka ọ gēweputara mba nile.o

2. Ọ gaghi-eti nkpu, ọ gaghi-eweli kwa olu-ya elu, Ọ gaghi-eme kwa ka anu olu-ya n'èzí.

3. Ọ gaghi-akpaji amì apiara apia, ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nēnwu inyoghi-inyogh: n'ezi-okwu ka ọ gēme ka ikpé puta.

4. Ọ gaghi-enwu inyoghi-inyoghi, agaghi-apia kwa ya apia n'obi, rue mb͕e o gēdowori ikpé n'uwa; ọ bu kwa iwu-ya ka agwe-etiti nile gēchere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 42