Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 41:3-20 Bible Nso (IGBOB)

3. Ọ nāchu ha, gabiga n'udo; o jighi ukwu-ya abà n'uzọ.

4. ònye luworo ya, me ya, nākpọ ọb͕ọ nile site na mb͕e mbu? Ọ bu Mu onwem, bú Jehova, Onye mbu, Nke nọye-kwa-ra ndi ikpe-azu, Mu onwem bu Onye ahu.

5. Agwe-etiti nile huru, we tua egwu; nsọtu nile nke uwa nāma jijiji: ha biaruru nso, we bia.

6. Ha yeritara onwe-ha aka n'otù n'otù; onye ọ bula nime ha nāsi nwa-nne-ya, Di ike.

7. Onye-ọ̀kà we me ka onye-nnucha-ọla di ike, onye ji otùtù akwọ ihe murumuru mere ka onye nētù osiama di ike, nēkwu okwu bayere nkpukọta, si, Nke ahu di nma: o were ǹtú kpọgidesi ya ike ka ewe ghara iwezuga ya n'ọnọdu-ya.

8. Ma gi onwe-gi, Israel, orùm, Jekob onye M'rọputara, nkpuru Abraham, bú onye nāhum n'anya;

9. gi onye M'jidesiworo ike site na nsọtu nile nke uwa, ọ bu kwa n'akuku-ya nile ka M'kpọputara gi, we si gi, Orùm ka i bu, arọputawom i, ajughm i aju:

10. atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.

11. Le, ihere gēme ndi ahu nile ndi iwe-ha di ọku n'aru gi, agētiye ha n'ọnọdu-ihere: ha gādi ka ihe nābughi ihe, we la n'iyì, bú ndi nāluso gi ọ̀gù.

12. I gāchọ ha, ma i gaghi-achọta ha, bú ndi gi na ha nēse okwu: ha gādi ka ihe nābughi ihe na dika ihe-efu, bú ndi nēbuso gi agha.

13. N'ihi na Mu onwem, Jehova, Chineke-gi, nējidesi aka-nri-gi ike, bú Onye nāsi gi, Atula egwu, Mu onwem eyeworo gi aka.

14. Atula egwu, gi idide, bú Jekob, unu ndikom Israel; Mu onwem eyeworo gi aka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ọzọ, Onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel.

15. Le, emewom ka i ghọ ihe-nkpọre eji azọcha ọka, bú ihe di nkọ di ọhu nwere ezé: i gāzọcha ugwu, zọpia ha, i gēme kwa ugwu ntà ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka.

16. I gāfucha ha, ifufe gēfepu kwa ha, oké ifufe gēfesa kwa ha: ma gi onwe-gi gēteghari egwú ọṅù na Jehova, n'Onye Nsọ nke Israel ka i gānya isi.

17. Ndi ewedara n'ala na umu-ob͕eye nāchọ miri ma ọ dighi nke dinu, ire-ha kpọsiri nku n'ihi akpiri kpọrọ nku; Mu onwem, bú Jehova, gāza ha, Mu, bú Chineke Israel, M'gaghi-arapu ha.

18. M'gākwaghe osimiri n'elu ugwu di iche iche ọhia nādighi, na isi-iyi n'etiti ndagwurugwu di iche iche: M'gēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri, me kwa ka ala ọkpọ-nku ghọ ebe miri nāsuputa.

19. M'gāku n'ọzara osisi cedar na osisi acacia na osisi myrtle na osisi manu; M'gāmakọta n'ala ihe nādighi osisi fir na osisi pine na osisi cypress:

20. ka ha we hu, mara, tukwasi obi, nwe uche ighọta n'otù, na aka Jehova mere nka, na Onye Nsọ nke Israel kère ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 41