Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 41:25-29 Bible Nso (IGBOB)

25. Akpọtewom otù onye site n'Ugwu, o we bia, otù onye site n'ọwuwa-anyanwu nke gākpọku aham: ọ gābiakwasi kwa ndi nọchiri anya eze dika agāsi na ha bu urọ, na dika ọkpu-ite si azọ ájá.

26. Ònye gosiworo ya site na mbu, ka ayi we mara? na site na mb͕e gara aga, ka ayi we si, Ọ bu onye ezi omume? e, ọ dighi onye nēgosi, e, ọ dighi onye nēme ka ayi nuru, e, ọ dighi onye nānu okwu-ọnu-unu.

27. Abum onye mbu isi Zaion, Le, le ha: M'gēnye kwa Jerusalem onye nēzisa ozi ọma.

28. M'we le, ma ọ dighi onye M'huru; n'etiti ndia kwa, ma ọ dighi onye-ndum-ọdu di, ka M'we jua ha ajuju, ha we zaghachim okwu.

29. Le, ha nile bu ajọ ihe; ihe-efu ka ọlu nile ha bu: ifufe na ebe tọb͕ọrọ n'efu ka arusi nile ha awuru awu bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 41