Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 41:18-25 Bible Nso (IGBOB)

18. M'gākwaghe osimiri n'elu ugwu di iche iche ọhia nādighi, na isi-iyi n'etiti ndagwurugwu di iche iche: M'gēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri, me kwa ka ala ọkpọ-nku ghọ ebe miri nāsuputa.

19. M'gāku n'ọzara osisi cedar na osisi acacia na osisi myrtle na osisi manu; M'gāmakọta n'ala ihe nādighi osisi fir na osisi pine na osisi cypress:

20. ka ha we hu, mara, tukwasi obi, nwe uche ighọta n'otù, na aka Jehova mere nka, na Onye Nsọ nke Israel kère ya.

21. Wetanu okwu-ikpe-unu nso, ka Jehova nāsi; butenu ihe nile unu dabere nso, ka Eze Jekob nāsi.

22. Ka ha bute ha nso, gosi ayi ihe ahu nke gēme: gosinu ihe nile emere na mb͕e mbu, ihe ha bu, ka ayi we tukwasi ha obi-ayi, we mara ikpe-azu-ha; ma-ọbu menu ka ayi nuru ihe ahu nile nke nābia.

23. Gosinu ihe ahu nile gābia n'ọdi-n'iru, ka ayi we mara na chi ka unu bu: e, menu ezi ihe, ma-ọbu menu ihe ọjọ, ka ayi we lerita onwe-ayi anya gburugburu n'ujọ, hu ya n'otù.

24. Le, unu onwe-unu sitere n'ihe nābughi ihe, ọlu-unu site-kwa-ra n'ihe-efu: ihe-árú ka onye nārọputa unu bu.

25. Akpọtewom otù onye site n'Ugwu, o we bia, otù onye site n'ọwuwa-anyanwu nke gākpọku aham: ọ gābiakwasi kwa ndi nọchiri anya eze dika agāsi na ha bu urọ, na dika ọkpu-ite si azọ ájá.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 41