Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 41:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. B͕anu nkiti gem nti, unu agwe-etiti; ka ndi nile di iche iche b͕anwe kwa ike-ha: ka ha biarue nso; ka ha kwue okwu: ka ayi biarue onwe-ayi nso ikpe ikpe.

2. Ònye kpọteworo otù onye site n'ọwuwa-anyanwu, onye Ọ kpọrọ n'ezi-omume ibiarute ukwu-Ya? Ọ nēwere mba di iche iche nye n'iru ya, Ọ nēme kwa ya ka ọ nwe ike n'aru ndi-eze: O nēwere ha nye mma-agha-ya dika ájá, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke anēfepu efepu, otú a ka Ọ nēwere ha nye uta-ya.

3. Ọ nāchu ha, gabiga n'udo; o jighi ukwu-ya abà n'uzọ.

4. ònye luworo ya, me ya, nākpọ ọb͕ọ nile site na mb͕e mbu? Ọ bu Mu onwem, bú Jehova, Onye mbu, Nke nọye-kwa-ra ndi ikpe-azu, Mu onwem bu Onye ahu.

5. Agwe-etiti nile huru, we tua egwu; nsọtu nile nke uwa nāma jijiji: ha biaruru nso, we bia.

6. Ha yeritara onwe-ha aka n'otù n'otù; onye ọ bula nime ha nāsi nwa-nne-ya, Di ike.

7. Onye-ọ̀kà we me ka onye-nnucha-ọla di ike, onye ji otùtù akwọ ihe murumuru mere ka onye nētù osiama di ike, nēkwu okwu bayere nkpukọta, si, Nke ahu di nma: o were ǹtú kpọgidesi ya ike ka ewe ghara iwezuga ya n'ọnọdu-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 41