Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 38:11-22 Bible Nso (IGBOB)

11. Asirim, M'gaghi-ahu Ja, ọbuná Ja n'ala ndi di ndu:M'gaghi-elegide kwa madu anya ọzọ n'etiti ndi bi n'ala ọgwugwu-ndu.

12. Emewo ka ebe-obibim bulie ije, esiwo kwa n'ebe m'nọ bulaga ya dika ulo-ikwū onye-ọzùzù-aturu:Apiakọtawom ndum dika ọkpa-ákwà si apiakọta ákwà; na ǹkwé-ákwà ka Ọ gēbipum:Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia.

13. Edozirim nkpuru-obim rue ututu; dika ọdum, otú a ka Ọ nānyaji ọkpukpum nile:Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia.

14. Dika eleke ma-ọbu ub͕ala, otú a ka m'nēbe ebe;Anamekwo ákwá dika nduru: anyam abua atalatawo n'ile anya n'elu;Jehova, anēmeb͕um emeb͕u, nọrọm mbe.

15. Gini ka m'gēkwu? Ọ gwaram okwu, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya:M'ganēje nwayọ arọm nile n'ihi idi-ilu nke nkpuru-obim.

16. Onye-nwe-ayi, ihe ndia ka madu ji adi ndu,Ọ bu kwa nime ha ka ndu mọm dichasi:I gēme kwa ka aru dim ike; Gi me kwa ka m'di ndu.

17. Le, ihe m'ji nwe ihe di ilu ilu bu ka m'we nata udo:Ma Gi onwe-gi huru nkpuru-obim n'anya si-ike, we si n'olùlù nke itọb͕orọ-n'efu dọputam:N'ihi na I tufuru nmehiem nile n'azu Gi.

18. N'ihi na ala-mọ adighi-ekele Gi, ọnwu adighi-eto Gi:Ndi nārida n'olùlù adighi-ele anya ezi-okwu-Gi.

19. Onye di ndu, onye di ndu, onye ahu gēkele Gi, dika m'si eme ta:Nna gēme ka umu mara ezi-okwu-Gi.

20. Jehova ejikerewo izọputam:Ubọ-akwaram nile ka ayi ganākpọUbọchi nile nke ndu-ayi n'ulo Jehova.

21. Aisaia we si, Ka ha were mbadamba fig, makwasi ya n'elu ihe-ofifi ahu, ọ gādiri ndu.

22. Hezekaia we si, Gini gābu ihe-iriba-ama na m'gārigoru ulo Jehova n'ubọchi nke-atọ?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 38