Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 38:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na onye nānwu anwu ka i bu, I gaghi-adi kwa ndu.

2. Hezekaia we chigharia iru-ya che mb͕idi iru, kpere Jehova,

3. si, Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.

4. Okwu Jehova we rue Aisaia nti, si,

5. Je, si Hezekaia, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M'nātukwasi arọ iri na ise n'ubọchi-gi.

6. M'gānaputa kwa gi na obodo a n'ọbu-aka eze Asiria, b͕ochi kwa obodo a.

7. Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama sitere n'aka Jehova, na Jehova gēme ihe a nke O kwuru:

8. le, M'nēme ka onyinyo nke di n'ebe-nrigo, nke ridaworo n'ebe-nrigo Ehaz site n'anyanwu, ka ọ la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri. Anyanwu we la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri n'ebe-nrigo ahu nke ọ ridaworo n'elu ya.

9. Odide-akwukwọ nke Hezekaia eze Juda, mb͕e ọ riara ọria, o we puta N'ọrìa-ya nwe aru-ike.

10. Mu onwem siri, Ọ bu n'idi-jū nke ubọchim nile ka m'ghaghi ila n'ọnu-uzọ-ama nke ala-mọ.Anapuwom arọm fọduru afọdu.

11. Asirim, M'gaghi-ahu Ja, ọbuná Ja n'ala ndi di ndu:M'gaghi-elegide kwa madu anya ọzọ n'etiti ndi bi n'ala ọgwugwu-ndu.

12. Emewo ka ebe-obibim bulie ije, esiwo kwa n'ebe m'nọ bulaga ya dika ulo-ikwū onye-ọzùzù-aturu:Apiakọtawom ndum dika ọkpa-ákwà si apiakọta ákwà; na ǹkwé-ákwà ka Ọ gēbipum:Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia.

13. Edozirim nkpuru-obim rue ututu; dika ọdum, otú a ka Ọ nānyaji ọkpukpum nile:Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia.

14. Dika eleke ma-ọbu ub͕ala, otú a ka m'nēbe ebe;Anamekwo ákwá dika nduru: anyam abua atalatawo n'ile anya n'elu;Jehova, anēmeb͕um emeb͕u, nọrọm mbe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 38