Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 36:3-16 Bible Nso (IGBOB)

3. Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we pukuru ya.

4. Rabshake we si ha, Biko, sinu Hezekaia, Otú a ka eze uku ahu siri, bú eze Asiria, Gini bu ntukwasi-obi a nke i ji tukwasi obi?

5. Asim, Ọ bu nání okwu eb͕ub͕ere-ọnu, na ndum-ọdu na idi-ike di iji bu agha: ub͕u a ònye ka i tukwasiworo obi, na i nupuwo isi n'okpurum?

6. Le, i tukwasiwo obi n'aru nkpa-n'aka amì a piara apia, bú n'aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n'ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n'ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ.

7. Ma ọ buru na i sim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu Onye Hezekaia wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N'iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala?

8. Ma ub͕u a, biko, were onwe-gi mere onye-nwem, bú eze Asiria, ihe-ibe, ka m'nye kwa gi nnù inyinya ise, ọ buru na i puru inyere onwe-gi ndi gānọkwasi ha.

9. Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n'aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya?

10. Ma ub͕u a ọ̀ bu n'ejighi Jehova ka m'rigoro imegide ala nka ibibi ya? Jehova sirim, Rigo imegide ala nka, bibie ya.

11. Elaiakim na Shebna na Joa we si Rabshake, Biko, gwa ndi-orù-gi okwu n'asusu Siria; n'ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: agwa-kwa-la ayi okwu n'asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n'elu mb͕idi.

12. Rabshake we si, Ọ̀ bu ijekuru onye-nwe-gi na ijekuru gi ka onye-nwem ziterem ikwu okwu ndia? ọ̀ bughi n'ihi ndikom ahu ndi nānọdu n'elu mb͕idi, ka ha we soro unu rie ǹsí-ha, ṅu kwa ma-amiri?

13. Rabshake we guzo, were oké olu kpọ n'asusu ndi-Ju, si, Nurunu okwu nile nke eze uku ahu, bú eze Asiria.

14. Otú a ka eze siri, Unu ekwela ka Hezekaia rafue unu: n'ihi na ọ pughi inaputa unu:

15. unu ekwe-kwa-la ka Hezekaia me ka unu tukwasi Jehova obi, si, Jehova aghaghi inaputa ayi; agaghi-enye obodo a n'aka eze Asiria.

16. Unu egela Hezekaia nti: n'ihi na otú a ka eze Asiria siri, Merenum ihe-ngọzi, pukutekwam; ri-kwa-nu, nwoke ọ bula nkpuru vine-ya, na nwoke ọ bula nkpuru osisi fig ya, ṅu-kwa-nu, nwoke ọ bula miri olùlù-miri-ya:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 36