Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 36:18-22 Bible Nso (IGBOB)

18. Lezienu anya ka Hezekaia we ghara irafu unu, si, Jehova gānaputa ayi. Chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo, onye ọ bula ala-ya, n'aka eze Asiria?

19. Òle ebe chi nile nke Hemat na Apad di? òle ebe chi nile nke Sefavaim di? hà anaputawo kwa Sameria n'akam?

20. Òle ndi n'etiti chi nile nke ala ndia ka ha bu, bú ndi naputara ala-ha n'-akam, na Jehova gānaputa Jerusalem n'akam?

21. Ma ha b͕ara nkiti, ha azaghi kwa ya okwu: n'ihi na ihe eze nyere n'iwu bu nka, si, Unu azala ya.

22. Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we biakute Hezekaia, ha na uwe-ha dọwara adọwa, ha we gosi ya okwu nile nke Rabshake.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 36