Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 34:7-16 Bible Nso (IGBOB)

7. Atu gēso kwa ha rida, umu-oke-ehi kwa, ha na oke-ehi; ala-ha gāṅuju kwa ọbara afọ, agēme kwa ka ájá-ha ma abuba site n'abuba.

8. N'ihi na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ di Jehova nwere, arọ nkwughachi diri ise-okwu Zaion.

9. Iyi-ya nile gāb͕anwe pitch, ájá-ya gāb͕anwe kwa brimstone, ala-ya gāghọ kwa pitch nēre ọku.

10. N'abali ma-ọbu n'ehihie ọ gaghi-anyu anyu; rue mb͕e ebighi-ebi ka anwuru-ọku-ya gākwugo: site n'otù ọb͕ọ rue ọb͕ọ ọzọ ọ gātọb͕ọrọ n'efu; rue mb͕e nile ebighi-ebi ọ dighi onye nāgabiga nime ya.

11. Ma okwolo na ebinta gēnweta ya; okwukwu na ugolo-ọma gēbi nime ya: Ọ gēseti kwa eriri nke itọb͕ọrọ-n'efu na nkume-ọtùtù nke itọb͕ọrọ-nkiti n'elu ya.

12. Ndi-ya amara aha-ha ka ha gākpọ inwe ala-eze, ma ọ dighi onye nọ n'ebe ahu; ndi-isi-ya nile gāghọ kwa ihe-efu.

13. Ogwu gēpú kwa n'ulo-elu-ya nile, akuba na ọhia-ogwu n'ebe-ya nile ewusiri ike: o we ghọ ebe-obibi nkita-ọhia, ogige nke diri enyi-nnunu.

14. Anu-ọhia bi n'ala kpọrọ nku gēzute kwa anu-ọhia nēbe ebe, nkpi-ọhia gākpọ kwa ibe-ya; ọzọ, n'ebe ahu ka lilith gānọdu, chọtara onwe-ya ebe-izu-ike.

15. N'ebe ahu ka agwọ di ngwa gēme akwu-ya, yie àkwá, bua umu, kpokọba ha n'okpuru ǹdò-ya: ọzọ, n'ebe ahu ka ndab͕u gēzukọta, otù na ibe-ya.

16. Chọputanu n'akwukwọ Jehova, gua: ọ dighi otù nime ndia fọduru inọ ya, otù eleghi anya ibe-ya ma ọ biagh: n'ihi na ọnum, nke ahu nyere iwu, Mọ-Ya kwa, Ya onwe-ya chikọtara ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 34