Ọzọ, ìhè ọnwa gādi ka ìhè anyanwu, ìhè anyanwu gādi kwa okpukpu asa, dika ìhè ubọchi asa, n'ubọchi Jehova gēkechi nkpaji akpajiri ndi-Ya, mb͕e Ọ gāgwọ kwa ọnyá etiputara n'otiti-ya.