Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 30:12-24 Bible Nso (IGBOB)

12. N'ihi nka ka Onye Nsọ nke Israel ji si otú a, N'ihi na unu juru okwu a, tukwasi obi na nmeb͕u na nsihie-uzọ, we nādabere ya;

13. n'ihi nka ajọ omume a gādiri unu ka nb͕awa nāda ada, nke nākwọputa akwọputa na mb͕idi di elu, nke ọ bu na mberede n'otù ntabi-anya ka ntipia-ya nābia.

14. Ọ gētiwa kwa ya dika esi etiwa ite ndi-ọkpu-ite nākpu, nke etipiara etipia, Ọ gaghi-enwe ọmiko: ewe ghara ichọta n'etiti ntipia-ya otù ejùjù iji guru ọku n'okpukpo-ntu, ma-ọbu iji kupu miri n'ọdọ-miri.

15. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, siri, Nime nlata na izu-ike ka agāzọputa unu; n'inọ-jū na n'itukwasi-obi ka idi-ike-unu gādi: ma unu ekweghi.

16. Kama unu siri, É-è, n'ihi na inyinya ka ayi gānọkwasi b͕alaga; n'ihi nka unu gāb͕alaga: unu si-kwa-ra, Anu di ngwa ka ayi gānọkwasi; n'ihi nka ka ndi nāchu unu gādi ngwa.

17. Nnù abua na ọgu iri gēsi n'iru iba-nba nke otù onye b͕alaga; n'iru iba-nba nke madu ise ka unu gēsi b͕alaga: rue mb͕e unu gāfọdu dika otù osisi-ọkọlọtọ n'elu ugwu, na dika ọkọlọtọ n'elu ugwu ntà.

18. Ọ bu kwa n'ihi nka ka Jehova gēchere, imere unu amara, ọ bu kwa n'ihi nka ka agēbuli Ya, inwe obi-ebere n'aru unu: n'ihi na Chineke nke ikpé ka Jehova bu; ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nile ndi nēchere Ya bu.

19. N'ihi na otù ndi gēbi na Zaion nime Jerusalem: i gaghi-akwa ákwá ọzọ ma-ọli: Ọ gēmere gi amara n'ezie n'olu iti-nkpu-gi; mb͕e Ọ nuru Ọ gāza gi otù mb͕e ahu.

20. Onye-nwe-ayi gēnye kwa unu nri ahuhu na miri nmeb͕u, ma ndi-ozizí-gi agaghi-ezobe onwe-ha ọzọ, kama anya-gi abua ganāhu ndi-ozizí-gi:

21. nti-gi abua gānu kwa okwu n'azu-gi, si, Nka bu uzọ, jenu ije nime ya; mb͕e unu nēche iru n'aka-nri, na mb͕e unu nēche iru n'aka-ekpe.

22. Unu gēmeru kwa ihe amachitara arusi ọla-ọcha gi nile apiri api, na ihe awuchitara arusi ọla-edo gi awuru awu: i gātusa ha dika ihe ruru inyi; i gāsi ya, Pua.

23. Ọ gēnye kwa míri-ozuzo nke nkpuru-ọghigha-gi, nke i gāgha n'ala-ubi-gi; na achicha nke ihe-omume nke ala-ubi, ọ gāma kwa abuba, ba uba: n'ubọchi ahu anu-ulo-gi nile gāta nri n'ebe-íta-nri sara mbara.

24. Ehi kwa na umu-inyinya-ibu nālu ubi gāta nri agwara agwa nke nnú di ya, nke ejiworo osekè na ihe-ifucha-ọka fucha ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 30