1. N'ihi na, le, Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēsi na Jerusalem, si kwa na Juda, wezuga ihe-ndabere na nkpa-n'aka, ihe-ndabere nile, bú nri, na ihe-ndabere nile, bú miri;
2. dike, na onye-agha; na onye-ikpe, na onye-amuma, na onye nāju ase, na okenye;
3. onye-isi nke ọgu ndi-agha abua na iri, na onye anāhu iru-ọma, na onye-ndum-ọdu, na onye mara ihe n'etiti ndi-ọ̀kà, na onye-nghọta n'irà urà.
4. M'gēwere kwa umu-okoro nye ka ha buru ndi-isi-ha, umu nāṅu ara gāchi kwa ha.
5. Ndi ahu gāchirita onwe-ha n'ihe-ike, otù onye megide onye ọzọ, na otù onye megide ibe-ya: ha gēbulite onwe-ha, nwa-okoro megide okenye, na onye anēlilì megide onye anāsọpuru.
6. Mb͕e otù onye gējide nwa-nne-ya n'ulo nna-ya, si, I nwere uwe-nb͕okwasi, onye-ikpe ka i gāburu ayi, ka ihe-isu-ngọngọ a di kwa n'okpuru aka-gi:
7. ọ gēweli olu-ya n'ubọchi ahu, si, M'gaghi-abu onye-nkechi; n'ihi na ọ dighi nri di n'ulom, ọ dighi kwa uwe-nb͕okwasi: unu agaghi-edom onye-ikpe ndi-ayi.
8. N'ihi na Jerusalem asuwo ngọngọ, Juda adawo kwa: n'ihi na ire-ha na omume-ha nile nēmegide Jehova, inupu isi n'okpuru anya abua nke ebube-Ya.
9. Nmata ha nāmata iru madu n'ikpe azawo megide ha; nmehie-ha ka ha gosiwo-kwa-ra dika Sọdọm, ha ezobeghi ya. Ahuhu gādiri nkpuru-obi-ha! n'ihi na ha emesowo onwe-ha ihe ọjọ.
10. Sinu onye ezi omume, na ọ gādiri ya nma: n'ihi na nkpuru omume-ha nile ka ha gēri.
11. Ahuhu gādiri onye nēmebi iwu! ọ gādiri ya njọ: n'ihi na nmeso aka-ya abua mesoro madu ka agēme ya.
12. Ndim, ndi nāchi ha n'ihe-ike bu nwatakiri, ndinyom achiwo kwa ha. Gi ndim, ndi-nduzi-gi nēme ka i wagharia, ha elodawo kwa uzọ nke okporo-uzọ-gi nile.
13. Jehova nēguzo Onwe-ya ikpe ọnu-Ya, Ọ nēguzo kwa ikpe ndi nile di iche iche.
14. Jehova gēso ndi-okenye nke ndi-Ya na ndi-isi-ha ba n'ikpé, si, Ma unu onwe-unu, unu eripiawo ubi-vine; ihe unu napuworo onye ewedara n'ala n'ike di n'ulo-unu nile:
15. gini mere unu ji azọpia ndim, gwepia kwa iru onye ewedara n'ala? ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta.
16. Jehova we si, N'ihi na umu-ndinyom Zaion di npako, nēwere kwa olu setiri eseti na anya nāràrá ndikom ejeghari, nārọ nma mb͕e ha nējeghari, nēwere kwa ukwu-ha eme ka ọla-ukwu-ha da udà:
17. n'ihi nka Onye-nwe-ayi gēme kwa ka ọnyá di n'opu-n'isi umu-ndinyom Zaion, Jehova ga-agbaba kwa ha ọtọ.