Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 29:5-11 Bible Nso (IGBOB)

5. Ma ìgwè ndi ala ọzọ nēmegide gi gādi ka ájá di ntà, ìgwè ndi nēme ka madu ma jijiji gādi kwa ka ib͕ob͕o-ọka nke nāgabiga agabiga: ọ gādi kwa n'otù ntabi-anya na mberede.

6. Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēji éb͕è-elu-igwe, ji kwa ala-ọma-jijiji, na oké olu, na oké ifufe na ikuku uku, na ire-ọku nke -ọku nērichapu erichapu, leta ya.

7. Dika nrọ, bú ọhù nke abali, otú a ka ha gādi kwa, bú ìgwè mba nile ndi nēbuso Eriel agha, bú ndi nile nēbuso ya na ebe-ya ewusiri ike agha, nākpab͕u kwa ya.

8. Ọ gādi kwa ka mb͕e onye agu nāgu nārọ nrọ, ma, le, ọ nēri ihe; o we teta, ma nkpuru-obi-ya b͕ara aka: ma-ọbu dika mb͕e onye akpiri nākpọ nku nārọ nrọ, ma, le, ọ nāṅu miri; ọ we teta, ma, le, ọ dawo #mbà, nkpuru-obi-ya nāchọsi kwa ihe ike: otú a ka ìgwè mba nile gādi, ndi nēbuso ugwu Zaion agha.

9. Ka ọ b͕agwoju unu anya, ka o ju kwa unu anya; techienu anya-unu, ka etechi kwa anya-unu: ha aṅubigawo manya ókè, ma ọ bughi manya ka ha ṅubigara ókè; ha aṅaghariwo, ma ọ bughi ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya.

10. N'ihi na Jehova awukwasiwo unu mọ nke oké ura, we mechisie anya-unu ike, bú ndi-amuma; isi-unu, bú ndi-ọhù, ka O kpuchiwo-kwa-ra.

11. Ọhù a nile we diri unu ka okwu nke akwukwọ akasiri akàrà ike, nke anēnye onye mara akwukwọ, si, Biko, gua nka: o we si, Apughm, n'ihi na ihe akasiworo akàrà ike ka ọ bu:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 29