Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 29:18-23 Bible Nso (IGBOB)

18. Ndi nti chiri gānu kwa okwu nile nke akwukwọ n'ubọchi ahu, ọ bu kwa n'oké ọchichiri na n'ọchichiri ka anya ndi-ìsì gēsi hu uzọ.

19. Ndi di ume-ala n'obi gātukwasi kwa ihe n'ọṅù-ha nime Jehova, ndi-obeye n'etiti madu gēteghari kwa egwú ọṅù n'Onye Nsọ nke Israel.

20. N'ihi na onye nēme ka madu ma jijiji nwere ọgwugwu, onye nākwa emò agwusiwo kwa, ebipuwo kwa ndi nile nāmuru ajọ ihe anya:

21. bú ndi nēme ka madu mehie site n'okwu-ha, ndi nēsi-kwa-ra onye nāba nba n'ọnu-uzọ-ama ọnyà, we were ihe tọb͕ọrọ n'efu wezuga onye ezi omume.

22. N'ihi nka ka Jehova, bú Onye b͕aputara Abraham, kwuru okwu bayere ulo Jekob otú a, si, Ihere agaghi-eme Jekob ub͕u a, iru-ya agaghi-ab͕aru kwa ub͕u a.

23. Ma mb͕e ọ nāhu umu-ya, bú ọlu akam abua, n'etiti ya, ha gēdo aham nsọ; e, ha gēdo Onye Nsọ nke Jekob nsọ, ọ bu kwa n'iru Chineke nke Israel ka ha gāma jijiji.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 29