Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 29:17-21 Bible Nso (IGBOB)

17. Ọ̀ bughi nwa mb͕e ntà fọduru, Lebanon ewe ghọ ubi ọma, agu kwa ubi ọma n'oké ọhia?

18. Ndi nti chiri gānu kwa okwu nile nke akwukwọ n'ubọchi ahu, ọ bu kwa n'oké ọchichiri na n'ọchichiri ka anya ndi-ìsì gēsi hu uzọ.

19. Ndi di ume-ala n'obi gātukwasi kwa ihe n'ọṅù-ha nime Jehova, ndi-obeye n'etiti madu gēteghari kwa egwú ọṅù n'Onye Nsọ nke Israel.

20. N'ihi na onye nēme ka madu ma jijiji nwere ọgwugwu, onye nākwa emò agwusiwo kwa, ebipuwo kwa ndi nile nāmuru ajọ ihe anya:

21. bú ndi nēme ka madu mehie site n'okwu-ha, ndi nēsi-kwa-ra onye nāba nba n'ọnu-uzọ-ama ọnyà, we were ihe tọb͕ọrọ n'efu wezuga onye ezi omume.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 29