Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 28:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahuhu gādiri okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè, ahuhu gādi-kwa-ra okoko-ọhia nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n'isi nke ndagwurugwu di urù nke ndi manya-vine nēb͕u!

2. Le, otù onye di ike nke nwere ume ka Onye-nwe-ayi nwere; dika oké miri-ozuzo nke ákú-miri-ígwé, dika oké ifufe nke nēfechapu efechapu, dika oké miri-ozuzo nke miri di ike nērubiga ókè, otú a ka o jiworo ihe-ike tọb͕o ihe n'ala.

3. N'okpuru ukwu ka agāzọda okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè:

4. okoko-ọhia nke nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n'isi nke ndagwurugwu di urù, gādi kwa ka nkpuru-fig buru uzọ cha tutu mb͕e okpom-ọku erue; nke mb͕e onye ọ bula nke nāhu ya anya nāhu, mb͕e ọ nādi n'ọbu-aka-ya o lo ya.

5. N'ubọchi ahu Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāghọrọ ndi-Ya fọduru okpu-eze nke mara nma, na okpu ọma nke ima-nma:

6. Ọ gāghọ-kwa-ra onye nānọkwasi n'oche ikpé mọ nke ikpé, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi nāchughachi ndi nēbu agha rue ọnu-uzọ-ama idi-ike.

7. Ma ọbuná ndia adaghariwo site na manya-vine, ọ bu kwa site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ha ṅaghariworo; onye-nchu-àjà na onye-amuma adaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, manya-vine elodawo ha, ha aṅaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ha adaghariwo n'ọhuhu, ha asuwo ngọngọ n'ihe nile ekpere n'ikpe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 28