Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 23:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Ibu eboro Taia.Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish; n'ihi na ebibiwo ya, ulo we ghara idi ya, uzọ-nbata ghara kwa idi ya: esiwo n'ala Kitim kpughere ha ya.

2. Derenu du, unu ndi bi n'ala di oké osimiri buruburu; gi onye ndi-ahia Zaidon, bú ndi nāgabiga oké osimiri, mejuworo ihe.

3. N'elu ọtutu miri ka nkpuru-ọghigha Shaihoa, nke bu owuwe-ihe-ubi nke Nail, bu ihe-omume-ya; o we ghọ urù-ahia nke mba di iche iche.

4. Ka ihere me gi, Zaidon: n'ihi na oké osimiri ekwuwo, bú ebe siri ike nke oké osimiri, si, Ime emeghm, amuputakwaghm nwa, emekwaghm ka umu-okorọbia toputa, emekwaghm ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke tozue okè.

5. Mb͕e anuru ihe a n'Ijipt, ihe anuru bayere Taia gēme ka ha b͕alie.

6. Gabiganu rue Tashish; kwasienu ákwá ike, unu ndi bi n'ala di oké osimiri buruburu.

7. Ọ̀ bu nka ka anēme unu, gi obodo nāṅuri ọṅu, nke mb͕e gara aga ya sitere n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, onye ukwu-ya abua nēdu ya-ri je n'ebe di anya inọ dika ọbìa?

8. Ònye zubeworo nka megide Taia, bú obodo nke nēkpube ndi ọzọ okpu-eze, nke ndi-ahia-ya bu ndi-isi, nke ndi-ọzu-ahia-ya bu ndi-nsọpuru nke uwa?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 23