Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 22:5-18 Bible Nso (IGBOB)

5. N'ihi na otù ubọchi nke ọb͕ub͕a-aghara, na nke nzọda, na nke ib͕a madu ghari, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere, nime ndagwurugwu nke ọhù; ngwuda nke mb͕idi, na ntiku anētiku ugwu.

6. Ilam bu-kwa-ra àkpà-àkú, ya na usu madu, bú ndi-inyinya; Kia kpughepu-kwa-ra ọta.

7. O rue, na ndagwurugwu-gi nile arọputara arọputa juputara n'ub͕ọ-ala, ndi-inyinya do-kwa-ra onwe-ha n'usoro n'iru ọnu-uzọ-ama.

8. O we kpughepu ihe-nkwuchi nke Juda; i we legide ihe-agha di n'ulo oké ọhia anya n'ubọchi ahu.

9. Nb͕awa nile nke obodo Devid ka unu hu-kwa-ra, na ha di ọtutu: unu wukọba-kwa-ra miri nke ọdọ-miri di n'okpuru.

10. Ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem ka unu guru ọnu, unu we kwatue ulo nile ilusi mb͕idi ike.

11. Ebe-nchikọta-miri ka unu me-kwa-ra n'etiti mb͕idi-unu abua inagide miri nke ọdọ-miri ochie: ma unu elegideghi Onye nēme nka anya, ọ bu kwa Onye nākpu ya-ri site n'ebe di anya ka unu nēlekwasighi anya.

12. Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, we kpọsa ikwa ákwá, na iti aka n'obi n'újú, na ime isi-nkwọcha, na ike ákwà-nkpe n'úkwù n'ubọchi ahu:

13. ma, le, obi-utọ na ọṅù, ob͕ub͕u ìgwè ehi na ob͕ub͕u ìgwè ewu na aturu, oriri anu na ọṅuṅu manya-vine: ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu.

14. Jehova nke usu nile nke ndi-agha we kpughepu Onwe-ya na ntim abua, si, N'ezie agaghi-ekpuchiri unu ajọ omume a rue mb͕e unu gānwu, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri.

15. Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Je, bakuru odozi-àkù a, bú Shebna, nke bu onye-isi ulo, si,

16. Gini ka i nwere n'ebe a? ma-ọbu ònye ka i nwere n'ebe a, na i gwuwaworo ílì nye onwe-gi n'ebe a? ọ nēgwuwa ílì-ya n'elu, ọ nākàra onwe-ya ebe-obibi nime nkume di elu!

17. Le, Jehova gaje itudasi gi ike, gi nwoke; e, Ọ gaje ipiakọta gi apiakọta.

18. Ọ gāfukọtasi gi ike dika ihe-ọtutú tua gi n'ala sara mbara n'aka abua; n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ub͕ọ-ala nile nke nsọpuru-gi gādi, gi ihe-nlelì nke ulo onye-nwe-gi!

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 22