Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 2:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu nke Aisaia nwa Emoz huru bayere Juda na Jerusalem.

2. O gēru kwa n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ya elu kari ugwu ntà nile; mba nile gērùbà nime ya dika osimiri.

3. Ọtutu ndi di iche iche gēje kwa, si, Bianu, ka ayi rigorue ugwu Jehova, rue ulo Chineke nke Jekob; O gēzí kwa ayi uzọ-Ya ufọdu, ayi gēje kwa ije n'okporo-uzọ-Ya nile: n'ihi na Zaion ka iwu gēsi puta, okwu Jehova gēsi kwa na Jerusalem puta.

4. Ọ gēkpe kwa ikpe n'etiti mba nile, dozi-kwa-ra ọtutu ndi di iche iche okwu-ha: ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ.

5. Ulo Jekob, bianu, ka ayi jegharia n'ìhè Jehova.

6. N'ihi na I rapuwo ndi-Gi, bú ulo Jekob, n'ihi na ha juputara n'ome-n'ala site n'Iru-anyanwu, ha bu kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ dika ndi Filistia, ọzọ, ha na umu ndi ala ọzọ nēkwekọ aka.

7. Ala-ha juputa-kwa-ra n'ọla-ọcha na ọla-edo, ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù-ha; ala-ha juputa-kwa-ra n'inyinya, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ub͕ọ-ala-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 2