Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 19:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ibu eboro Ijipt.Le, n'igwe-oji nke nāb͕a ọsọ ka Jehova nānọkwasi dika inyinya, O we bia rue Ijipt: ihe-efu nile nke Ijipt gēme kwa nkpatu n'iru Ya, obi Ijipt gālọ kwa ya miri n'etiti ya.

2. M'gākwali kwa Ijipt megide Ijipt: ha gēbu kwa agha, onye ọ bula megide nwa-nne-ya, onye ọ bula megide kwa ibe-ya, obodo megide obodo, ala-eze megide ala-eze.

3. Ewe wusi mọ Ijipt n'etiti ya; ndum-ọdu-ya ka M'gēloda kwa: ha gāju kwa ihe-efu nile ha ase, ju kwa ndi-ntamu-ha, ju kwa ndi nāju mọ ihe, ju kwa ndi-dibia-afa.

4. M'gēmechibido Ijipt n'aka onye-nwe-ha nēme ihe-ike; eze di ike gāchi kwa ha, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta.

5. Ọzọ, miri gātada n'oké osimiri, osimiri gātasia takọrọ.

6. Osimiri-ya nile gēsì kwa ísì; osimiri Nail nile nke Ijipt gātalata we tasia: amì na achara gājanwu.

7. Ala ahihia ndu n'akuku Nail, n'usọ Nail, na ebe ọ bula anāgha nkpuru n'akuku Nail, gātakọrọ, efesa ha, ha we ghara idi.

8. Ndi-ọkù gēze kwa ume, ndi nile ndi nātubà nko-azù nime Nail gēru kwa újú, ndi nāb͕asa ub͕u n'elu miri gāta kwa aru.

9. Ọzọ, ihere gēme ndi nālu ọlu flax etiri eti na ndi nākpa ákwà ọcha.

10. Ide-ya nile gāghọ ihe etipiara etipia, ndi nile nke nālu ọlu inara ugwọ-ọlu gābu ndi erudara eruda na nkpuru-obí.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 19