Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 16:7-12 Bible Nso (IGBOB)

7. N'ihi nka ka Moab gākwasiri Moab ákwá ike, ọ gākwasi ákwá ike, ka ọ ra: iri mbadamba nkpuru-vine nke Kia-hareset ka unu gātamu ntamu, ebe unu bu nání ndi apiaworo ihe.

8. N'ihi na ubi nile nke Heshbon nātalata, ha na osisi vine nke Sibma; ndi-nwe mba nile ka osisi vine ya kachasi nma tib͕uworo; ọbumá na Jeza ka ha ruru, ha waghariri n'ọzara; alaka-ya wasara awasa, ha gabigara oké osimiri.

9. N'ihi nka m'gēji ikwa-ákwá nke Jeza kwara osisi vine nke Sibma: m'gēji anya-mirim dè gi dika miri-ozuzo, gi Heshbon, na Eleale: n'ihi na n'elu nghọkọta-nkpuru-gi na n'elu owuwe-ihe-ubi-gi ka iti-nkpu-agha daworo.

10. Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọǹù n'ubi ọma; agaghi-eti kwa nkpu ọṅù tisie ya ike n'ubi-vine nile: onye-nzọcha agaghi-azọchaputa manya-vine n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile; emewom ka iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine kwusi.

11. N'ihi nka ngiri-afọm nādara Moab udà dika ubọ-akwara, ime-afọm nāda-kwa-ra Kia-heres.

12. O gēru kwa, mb͕e o mere ka ahu ya, mb͕e ike gwuru ya, bú Moab, n'elu ebe-ya di elu, mb͕e ọ gābiaru ebe nsọ ya ikpe ekpere, na ọ gaghi-enwe ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 16