Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 11:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Ome gēsi kwa n'ogwe-osisi Jesi puta, otù alaka nke sitere na nkpọrọgwu-ya gāmi kwa nkpuru:

2. Mọ nke Jehova gēnwe kwa ọnọdu-Ya n'aru ya, bú Mọ nke amam-ihe na nghọta, Mọ nke ndum-ọdu na idi-ike, Mọ nke ihe-ọmuma na egwu Jehova;

3. ọzọ, ihe nātọ ya utọ bu egwu Jehova: ọ bughi kwa dika anya-ya abua si ahu ka ọ gēkpe ikpe, ọ bughi kwa dika nti-ya abua si anu ka ọ gāba nba:

4. kama ọ gēji ezi omume kpe ndi nēnweghi ike ikpe, ọ gēji kwa izi-ezi ba nba bayere ndi di ume-ala n'obi n'uwa: ọ gēji kwa ndele nke ọnu-Ya tib͕ue uwa, ọ gēji kwa iku-ume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua me ka ndi nēmebi iwu nwua.

5. Ezi omume gābu kwa ihe-ọkiké ume-Ya, ikwesi-ntukwasi-obi gābu kwa ihe-ọkiké úkwù-Ya.

6. Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gānọ kwa, agu na nwa-ewu gāmakpukọ kwa; nwa-ehi na nwa-ọdum na nwa anu emere ka ọ ma abuba gādi kwa n'otù ebe; nwatakiri ganēdu kwa ha.

7. Nne-ehi na anu-ọhia bear gātakọ kwa nri; umu-ha gāmakpukọ: ọdum gāta kwa okporo-ọka dika ehi.

8. Nwa nāṅu ara gēgwuri kwa egwú n'elu ọnu aju-ala nọ, ọ bu kwa anya ubí ka nwa emere ka ọ rapu ara gātukwasi aka-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 11