Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 10:32-34 Bible Nso (IGBOB)

32. Ubọchi nke ta ọ bu nime Nob ka o gēguzo: ọ nēfeghari aka-ya n'ebe ugwu ada Zaion di, bú ugwu ntà Jerusalem.

33. Le, Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēwere ihe nākpata ima-jijiji kwachapu ngalaba: anēb͕utu kwa ndi topuworo elu, anēme kwa ndi di elu ka ha di ala.

34. Ọ gēwere kwa ígwè b͕utusia alughi-ulù nile nke oké ọhia, Lebanon gēsite kwa n'aka onye di ike nke-uku da.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 10