Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 99:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova bu eze; ka ndi nile di iche iche ma jijiji:Ọ nēbi n'etiti cherubim; ka uwa me nkpatu.

2. Jehova di uku nime Zaion;Onye di elu ka Ọ bu kwa n'elu ndi nile di iche iche.

3. Ka ha kele aha-Gi nke di uku, nke anātu kwa egwu ya:Onye nsọ ka Ọ bu.

4. Ike nke eze nāhu kwa ezi ikpé n'anya;Gi onwe-gi emewo ka izi-ezi guzosie ike,Ezi ikpé na ezi omume ka Gi onwe-gi meworo nime Jekob.

5. Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, elu,Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di:Onye nsọ ka Ọ bu.

6. Moses na Eron n'etiti ndi-nchu-àjà-Ya,Samuel kwa n'etiti ndi nākpọku aha-Ya;Ha nākpọku Jehova, Ya onwe-ya we za ha.

7. N'ogidi igwe-oji ka Ọ nāgwa ha okwu:Ha debere ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru O nyere ha.

8. Jehova, bú Chineke-ayi, Gi onwe-gi zara ha:Chineke Nke nēbupu nmehie ka I buru ha,Ma I bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ omume nile ha,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 99