Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 97:8-11 Bible Nso (IGBOB)

8. Zaion nuru, we ṅuria,Umu-ndinyom Juda we tegharia egwu ọǹù;N'ihi ikpé-Gi nile, Jehova.

9. N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile:Emewo ka I di elu nke-uku n'elu chi nile.

10. Unu ndi nāhu Jehova n'anya, kpọnu ihe ọjọ asì:Ọ nēdebe nkpuru-obi ndi-ebere-Ya;Ọ nānaputa ha n'aka ndi nēmebi iwu.

11. Aghaworo onye ezi omume ìhè dika nkpuru,Aghawo-kwa-ra ndi ziri ezi n'obi ọṅù.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 97